Nehemaya 3

Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya.

Nehemiah 3:28 (UKJV) From above the horse gate repaired the priests, every one opposite to his house.

26na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ahụ bụ ndị bi nʼelu ugwu Ofel, wuziri akụkụ nke na-esote ruo nʼebe dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, ruokwa nʼụlọ elu nche nke ụlọ ukwu ahụ.

27Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.

28Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya.

29Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.

30Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.