Nehemaya 3

Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.

Nehemiah 3:27 (UKJV) After them the Tekoites repaired another piece, opposite to the great tower that lies out, even unto the wall of Ophel.

25Palal nwa Uzai wuziri akụkụ nke na-eso ya site na nkuku mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu dị nʼakụkụ elu elu ụlọeze nʼebe dị nso nʼogige ndị nche. Nke so ya bụ Pedaia nwa Parosh,

26na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ahụ bụ ndị bi nʼelu ugwu Ofel, wuziri akụkụ nke na-esote ruo nʼebe dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, ruokwa nʼụlọ elu nche nke ụlọ ukwu ahụ.

27Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.

28Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya.

29Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.