Nehemaya 4

Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.

Nehemiah 4:10 (UKJV) And Judah said, The strength of the bearers of burdens is decayed, and there is much rubbish; so that we are not able to build the wall.

8Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ.

9Ma anyị kpere ekpere nye Chineke, kwụbakwa ndị nche iguzogide ha ehihie na abalị.

10Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.

11Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị.

12Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.