Nehemaya 4

Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.”

Nehemiah 4:12 (UKJV) And it came to pass, that when the Jews which dwelt by them came, they said unto us ten times, From all places whence all of you shall return unto us they will be upon you.

10Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.

11Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị.

12Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.”

13Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị.

14Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.