Nehemaya 4

Ya mere, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda opi, gbaranụ ọsọ bịa nʼebe m nọ. Chineke ga-alụkwara anyị ọgụ.”

Nehemiah 4:20 (UKJV) In what place therefore all of you hear the sound of the trumpet, resort all of you thither unto us: our God shall fight for us.

18Ndị ọzọ tinyere mma agha ha nʼukwu ha. Ndị na-egbu opi nọkwa m nʼakụkụ mgbe niile maka ịfụ opi mgbe a chọrọ ya.

19Mgbe ahụ, asịrị m ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị na ndị mmadụ ọzọ ahụ niile, “Ọrụ anyị nwere ịrụ dị ukwuu, gbasapụkwa, anyị anọkọtaghị ọnụ nʼotu ebe, ekewakwara anyị ebe dị iche iche na mgbidi.

20Ya mere, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda opi, gbaranụ ọsọ bịa nʼebe m nọ. Chineke ga-alụkwara anyị ọgụ.”

21Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche.

22Agwara m ndịisi ọrụ niile okwu sị ha na onyeisi ọrụ ọbụla na ndị na-enyere ya aka nʼọrụ ga na-anọ na Jerusalem nʼabalị niile. Nʼụzọ dị otu a, ndị ọrụ ga-arụ ọrụ ha nʼoge ihe dị, ma ha ga-anọkwa na nche nʼabalị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.