Nehemaya 4

Nʼoge ndị a niile, eyipụghị m uwe m yi nʼahụ. O nwekwaghị onye ọbụla ọzọ, maọbụ nwanne m nwoke, maọbụ ndị nche na-eso m onye yipụrụ uwe ya ma onye ukwu ma onye nta. Mma agha anyị na-adịkwa anyị nʼukwu mgbe niile, ọbụladị mgbe anyị chọrọ mmiri.

Nehemiah 4:23 (UKJV) So neither I, nor my brethren, nor my servants, nor the men of the guard which followed me, none of us put off our clothes, saving that every one put them off for washing.

21Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche.

22Agwara m ndịisi ọrụ niile okwu sị ha na onyeisi ọrụ ọbụla na ndị na-enyere ya aka nʼọrụ ga na-anọ na Jerusalem nʼabalị niile. Nʼụzọ dị otu a, ndị ọrụ ga-arụ ọrụ ha nʼoge ihe dị, ma ha ga-anọkwa na nche nʼabalị.

23Nʼoge ndị a niile, eyipụghị m uwe m yi nʼahụ. O nwekwaghị onye ọbụla ọzọ, maọbụ nwanne m nwoke, maọbụ ndị nche na-eso m onye yipụrụ uwe ya ma onye ukwu ma onye nta. Mma agha anyị na-adịkwa anyị nʼukwu mgbe niile, ọbụladị mgbe anyị chọrọ mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.