1Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha.
2Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.”
3Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.”