Nehemaya 5

Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.”

Nehemiah 5:3 (UKJV) Some also there were that said, We have mortgaged our lands, vineyards, and houses, that we might buy corn, because of the dearth.

1Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha.

2Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.”

3Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.”

4Ma ndị ọzọkwa na-asị, “Lee na anyị gbazitere ego anyị ji tụọ ụtụ isi eze maka ubi anyị na ubi vaịnị anyị.

5Nʼagbanyeghị na ọ bụ otu anụ ahụ na ọbara ka anyị na ndị Juu ọzọ nwere, dịka ụmụ ha dị ka ụmụ anyị dịkwa, ma anyị emeela ka ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ nʼime ụmụ anyị ndị inyom abụrụlarị ndị ohu, ma anyị enweghị ike nke aka anyị, nʼihi na ndị ọzọ bụ ndị nwezi ala ubi anyị na ubi vaịnị anyị niile.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.