Nehemaya 5

Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.”

Nehemiah 5:2 (UKJV) For there were that said, We, our sons, and our daughters, are many: therefore we take up corn for them, that we may eat, and live.

1Nʼoge ahụ, ụfọdụ ezinaụlọ bidoro itamu ntamu megide ndị Juu ibe ha.

2Ụfọdụ na-atamu na-asị, “Anyị na ụmụ anyị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị ga-eri nri dị ndụ, o kwesikwara ka anyị nwee ike ịzụrụ ọka.”

3Ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị agbaala ubi anyị, ubi vaịnị anyị na ụlọ anyị nʼibe ka anyị nweta mkpụrụ ubi nʼoge ụnwụ.”

4Ma ndị ọzọkwa na-asị, “Lee na anyị gbazitere ego anyị ji tụọ ụtụ isi eze maka ubi anyị na ubi vaịnị anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.