Nehemaya 4

Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ.

Nehemiah 4:6 (UKJV) So built we the wall; and all the wall was joined together unto the half thereof: for the people had a mind to work.

4Mgbe ahụ, e kpere m ekpere sị, “Chineke, biko nụrụ emo a na-akwa anyị. Ka ịkwa emo ha laghachikwa ha nʼisi; ka a dọtakwa ha nʼagha buru ha jee mba ọzọ.

5Elefula mmehie ha anya, agbagharakwala ha, nʼihi na ha ledara gị anya, ledakwa anyị anya, bụ ndị na-ewuzi mgbidi gị.”

6Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ.

7Ma mgbe Sanbalat, Tobaya, ndị Arab, ndị Amọn na ndị Ashdọd nụrụ na ọrụ iwuzi mgbidi Jerusalem na-aga nʼihu, nụkwa na-emechichala ebe niile puru epu, iwe were ha nke ukwuu.

8Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.