Nehemaya 5

Ayọgharịrị m ọnụ ọnụ uwe mwụda m sị, “Otu a ka Chineke ga-esi yọchapụ site nʼụlọ ha na ihe nweta ha onye ọbụla nke na-agaghị edebezu nkwa a.” Ndị niile zukọrọ kwere sị, “Amen.” Ha tokwara Onyenwe anyị: Ha niile mekwara ihe ha kwere na nkwa.

Nehemiah 5:13 (UKJV) Also I shook my lap, and said, So God shake out every man from his house, and from his labour, that performs not this promise, even thus be he shaken out, and emptied. And all the congregation said, Amen, and praised the LORD. And the people did according to this promise.

11Nyeghachinụ ha ala ubi ha niile ngwangwa, ma ubi vaịnị ha niile, ubi oliv ha niile, ụlọ ha niile na ọmụrụnwa nke unu na-anara ha nke bụ otu ụzọ nʼime narị nke ego, ọka, mmanya ọhụrụ na mmanụ.

12Ha sịrị, “Anyị ga-enyeghachi ha. Anyị agakwaghị anara ha ihe ọzọ. Anyị ga-emezu ihe i kwuru.” Mgbe ahụ, akpọkọtara m ndị nchụaja, mee ka ndị ndu na ndịisi ozi ṅụọ iyi imezu nkwa ha.

13Ayọgharịrị m ọnụ ọnụ uwe mwụda m sị, “Otu a ka Chineke ga-esi yọchapụ site nʼụlọ ha na ihe nweta ha onye ọbụla nke na-agaghị edebezu nkwa a.” Ndị niile zukọrọ kwere sị, “Amen.” Ha tokwara Onyenwe anyị: Ha niile mekwara ihe ha kwere na nkwa.

14Ọzọ, nʼime afọ iri na abụọ ahụ a họpụtara m ị bụ onyeisi ọchịchị na Juda, site nʼiri afọ abụọ nke ịbụ eze Ataksekses ruo nʼafọ iri atọ na abụọ ya, mụ na ụmụnne m esiteghị na nri a na-atụkọrọ onyeisi ọchịchị were ihe oriri ọbụla.

15Ma ọ bụghị otu a ka o si dị na mbụ, nʼihi na ndịisi ọchịchị niile buru m ụzọ chịa boro ndị ahụ ibu arọ dị ukwuu. Ha na-anakọta site nʼaka onye ọbụla iri mkpụrụ ọlaọcha anọ, tinyere ihe oriri na mmanya ha na-ewebatakwa. Ọbụladị ndị na-enyere ha aka mekpakwara ndị mmadụ ahụ. Ma emeghị m otu a, nʼihi ịtụ egwu Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.