Nehemaya 5

Ma otu ọ dị, ndịisi Juu ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri na ise na-eri nri na tebul m, tinyere ndị na-abịakwute anyị site na mba ndị dị anyị gburugburu.

Nehemiah 5:17 (UKJV) Moreover there were at my table an hundred and fifty of the Jews and rulers, beside those that came unto us from among the heathen that are about us.

15Ma ọ bụghị otu a ka o si dị na mbụ, nʼihi na ndịisi ọchịchị niile buru m ụzọ chịa boro ndị ahụ ibu arọ dị ukwuu. Ha na-anakọta site nʼaka onye ọbụla iri mkpụrụ ọlaọcha anọ, tinyere ihe oriri na mmanya ha na-ewebatakwa. Ọbụladị ndị na-enyere ha aka mekpakwara ndị mmadụ ahụ. Ma emeghị m otu a, nʼihi ịtụ egwu Chineke.

16Kama, anọgidesiri m ike nʼọrụ iwugharị mgbidi ahụ, achịkọtara ndị ikom m niile nʼebe ahụ nʼihi ije ozi a. Ọ dịghịkwa ala anyị zụrụ.

17Ma otu ọ dị, ndịisi Juu ọnụọgụgụ ha dị otu narị na iri na ise na-eri nri na tebul m, tinyere ndị na-abịakwute anyị site na mba ndị dị anyị gburugburu.

18Ihe na-ezu nri a na-eri nʼụlọ m kwa ụbọchị bụ otu ehi na atụrụ isii gbara abụba, na ọtụtụ ọkụkụ, na ụdị mmanya dị iche iche a na-ebubata kwa ụbọchị iri ọbụla. Nʼagbanyeghị nke a, ọ dịghị mgbe ọbụla m nara site nʼaka ha ụtụ ihe oriri nke onye na-achị ala kwesiri inweta, nʼihi na ha onwe ha nọ na mkpa dị ukwuu.

19Chineke m biko, echefula ihe m meere ndị a, gọzie m nʼụzọ nke gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.