Nehemaya 6

Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya.

Nehemiah 6:18 (UKJV) For there were many in Judah sworn unto him, because he was the son in law of Shechaniah the son of Arah; and his son Johanan had taken the daughter of Meshullam the son of Berechiah.

16Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.

17Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka.

18Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya.

19Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.