1Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.
2Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
3Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”