62Ndị agbụrụ: Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642).
63Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).
64Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
65Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
66Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360),