Nehemaya 7

Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

Nehemiah 7:65 (UKJV) And the Tirshatha said unto them, that they should not eat of the most holy things, till there stood up a priest with Urim and Thummim.

63Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).

64Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.

65Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

66Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360),

67nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise (245).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.