Nehemaya 7

Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000), iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530).

Nehemiah 7:70 (UKJV) And some of the chief of the fathers gave unto the work. The Tirshatha gave to the treasure a thousand drams of gold, fifty basons, five hundred and thirty priests' garments.

68Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise (245),

69ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720).

70Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000), iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530).

71Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200).

72Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.