69ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720).
70Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000), iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530).
71Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200).
72Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67).
73Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha. Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,