Nehemaya 8

Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu.

Nehemiah 8:1 (UKJV) And all the people gathered themselves together as one man into the street that was before the water gate; and they spoke unto Ezra the scribe to bring the book of the law of Moses, which the LORD had commanded to Israel.

1Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu.

2Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara.

3O chere ihu nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri were oke olu gụọ ya site nʼụtụtụ ruokwa ehihie nʼihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị ọzọ nwere ike ịghọta ihe o na-agụ. Mmadụ niile gekwara ntị na ngụpụta nke akwụkwọ iwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.