Nehemaya 9

Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.

Nehemiah 9:21 (UKJV) Yea, forty years did you sustain them in the wilderness, so that they lacked nothing; their clothes waxed not old, and their feet swelled not.

19“Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile.

20I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha.

21Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.

22“I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan.

23I mere ka ụmụ Izrel mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe, ị kpọbatara ha nʼala ahụ i gwara ndị bụ nna ha ka ha baa nweta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.