Nehemaya 9

“I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan.

Nehemiah 9:22 (UKJV) Moreover you gave them kingdoms and nations, and did divide them into corners: so they possessed the land of Sihon, and the land of the king of Heshbon, and the land of Og king of Bashan.

20I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha.

21Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.

22“I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan.

23I mere ka ụmụ Izrel mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe, ị kpọbatara ha nʼala ahụ i gwara ndị bụ nna ha ka ha baa nweta.

24Ụmụ ha banyere nweta ala ahụ. I meriri ndị Kenan nʼihu ha, bụ ndị bi nʼala ahụ. I weere ndị Kenan ahụ nyefee nʼaka ha, ha na ndị eze ha, na ndị niile bi nʼala ahụ ka ndị gị jiri ha mee ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.