Ọnụọgụgụ 1

Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.

Numbers 1:16 (UKJV) These were the renowned of the congregation, princes of the tribes of their fathers, heads of thousands in Israel.

14site nʼebo Gad, Eliasaf nwa Deuel

15site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.”

16Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel.

17Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha.

18Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.