28Site nʼụmụ Isaka, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
29Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Isaka dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
30Site nʼụmụ Zebụlọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
31Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Zebụlọn dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
32Site nʼụmụ Josef, ya bụ ụmụ Ifrem, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.