Ọnụọgụgụ 1

Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

Numbers 1:42 (UKJV) Of the children of Naphtali, throughout their generations, after their families, by the house of their fathers, according to the number of the names, from twenty years old and upward, all that were able to go forth to war;

40Site nʼụmụ Asha, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

41Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Asha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).

42Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

43Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

44Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.