Ọnụọgụgụ 1

Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.

Numbers 1:44 (UKJV) These are those that were numbered, which Moses and Aaron numbered, and the princes of Israel, being twelve men: each one was for the house of his fathers.

42Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

43Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

44Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.

45Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị.

46Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.