43Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
44Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya.
45Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị.
46Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550).
47A gụnyekọtaghị ọnụọgụgụ ebo nna nna Livayị nʼịgụ ọnụ a,