Ọnụọgụgụ 1

nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,

Numbers 1:48 (UKJV) For the LORD had spoken unto Moses, saying,

46Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550).

47A gụnyekọtaghị ọnụọgụgụ ebo nna nna Livayị nʼịgụ ọnụ a,

48nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,

49“Ị gaghị agụ ndị ebo Livayị ọnụ. Ị gakwaghị agbakọnye ọnụọgụgụ ha nʼọnụọgụgụ ndị Izrel.

50Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.