Ọnụọgụgụ 1

Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu.

Numbers 1:51 (UKJV) And when the tabernacle sets forward, the Levites shall take it down: and when the tabernacle is to be pitched, the Levites shall set it up: and the stranger that comes nigh shall be put to death.

49“Ị gaghị agụ ndị ebo Livayị ọnụ. Ị gakwaghị agbakọnye ọnụọgụgụ ha nʼọnụọgụgụ ndị Izrel.

50Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.

51Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu.

52Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha.

53Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.