17Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
18Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha.
19Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn.
20Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad.
21Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.