19Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn.
20Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad.
21Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.
22Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha.
23Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase.