29Mosis gwara Hobab nwa Reuel, nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ Onyenwe anyị gwara anyị sị, ‘Aga m enye unu.’ Bịa ka ị soro anyị. Anyị ga-emezi gị nke ọma nʼihi na Onyenwe anyị ekwela Izrel nkwa ọtụtụ ezi ihe.”
30Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
31Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ.
32Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla Onyenwe anyị ga-enye anyị.”
33Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.