2“Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru.
3Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
4Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.
5Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.
6Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.