4Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.
5Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.
6Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.
7Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.
8“Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.