Ọnụọgụgụ 10

“Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.

Numbers 10:8 (UKJV) And the sons of Aaron, the priests, shall blow with the trumpets; and they shall be to you for an ordinance for ever throughout your generations.

6Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.

7Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.

8“Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.

9Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.

10Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.