Ọnụọgụgụ 10

Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.

Numbers 10:7 (UKJV) But when the congregation is to be gathered together, all of you shall blow, but all of you shall not sound an alarm.

5Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije.

6Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.

7Mgbe a ga-akpọkọta ndị Izrel niile a ga-egbu opi, kama ụda ya ga-adị iche.

8“Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile.

9Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka Onyenwe anyị Chineke unu cheta unu, ma napụta unu site nʼaka ndị iro unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.