Ọnụọgụgụ 11

Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu.

Numbers 11:10 (UKJV) Then Moses heard the people weep throughout their families, every man in the door of his tent: and the anger of the LORD was kindled greatly; Moses also was displeased.

8Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee.

9Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị.

10Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu.

11Mosis jụrụ Onyenwe anyị sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a?

12Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.