32Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
33Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe.
34Nʼihi nke a, a kpọrọ aha ebe ahụ Kibrọt Hataava, nʼihi na nʼebe ahụ ka e liri ndị Izrel nwụrụ nʼihi oke ọchịchọ nri.
35Site na Kibrọt Hataava, ndị Izrel biliri njem rute Hazerọt ebe ha nọrọ.