Ọnụọgụgụ 11

Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe.

Numbers 11:33 (UKJV) And while the flesh was yet between their teeth, before it was chewed, the wrath of the LORD was kindled against the people, and the LORD stroke the people with a very great plague.

31Otu oke ifufe sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile.

32Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ.

33Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe.

34Nʼihi nke a, a kpọrọ aha ebe ahụ Kibrọt Hataava, nʼihi na nʼebe ahụ ka e liri ndị Izrel nwụrụ nʼihi oke ọchịchọ nri.

35Site na Kibrọt Hataava, ndị Izrel biliri njem rute Hazerọt ebe ha nọrọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.