1Miriam na Erọn malitere ikwu okwu megide Mosis, nʼihi na ọ lụrụ nwunye onye Kush.
2Ha kwuru sị, “Ọ bụ naanị site nʼọnụ Mosis ka Onyenwe anyị si agwa ndị ya okwu? Ọ naghị esitekwa nʼọnụ anyị kwuo okwu?” Onyenwe anyị nụrụ ihe ndị a ha kwuru.
3(Ma nwoke ahụ bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu karịa onye ọbụla nọ nʼelu ala.)