Ọnụọgụgụ 13

Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.

Numbers 13:21 (UKJV) So they went up, and searched the land from the wilderness of Zin unto Rehob, as men come to Hamath.

19Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.

20Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)

21Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.

22Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)

23Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.