Ọnụọgụgụ 13

Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.

Numbers 13:19 (UKJV) And what the land is that they dwell in, whether it be good or bad; and what cities they be that they dwell in, whether in tents, or in strong holds;

17Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu.

18Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.

19Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike.

20Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)

21Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.