Ọnụọgụgụ 13

A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.

Numbers 13:24 (UKJV) The place was called the brook Eshcol, because of the cluster of grapes which the children of Israel cut down from thence.

22Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.)

23Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.

24A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.

25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.

26Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.