Ọnụọgụgụ 13

Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.

Numbers 13:25 (UKJV) And they returned from searching of the land after forty days.

23Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.

24A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ.

25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.

26Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.

27Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.