11Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha.
12Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.”
13Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha.
14Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị Onyenwe anyị, matakwa na ị nọnyeere Izrel, na gị bụ Onyenwe anyị na ndị Izrel na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị Onyenwe anyị na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị.
15Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị,