Ọnụọgụgụ 14

Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.

Numbers 14:21 (UKJV) But as truly as I live, all the earth shall be filled with the glory of the LORD.

19Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.”

20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ.

21Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.

22Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a,

23o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.