17“Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo.
18Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.
19Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.”
20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ.
21Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube Onyenwe anyị.