Ọnụọgụgụ 14

Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ Onyenwe anyị, ha ruru ụjụ dị ilu.

Numbers 14:39 (UKJV) And Moses told these sayings unto all the children of Israel: and the people mourned greatly.

37Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị.

38Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ.

39Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ Onyenwe anyị, ha ruru ụjụ dị ilu.

40Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ Onyenwe anyị kwere anyị nkwa.”

41Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.