40Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ Onyenwe anyị kwere anyị nkwa.”
41Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma.
42Unu arịgokwala, nʼihi na Onyenwe anyị anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.
43Nʼihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.”
44Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na Mosis maọbụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ.