Ọnụọgụgụ 14

Mgbe ahụ, ndị Amalek na ndị Kenan bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo Homa.

Numbers 14:45 (UKJV) Then the Amalekites came down, and the Canaanites which dwelt in that hill, and stroke them, and humiliated them, even unto Hormah.

43Nʼihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.”

44Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na Mosis maọbụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ.

45Mgbe ahụ, ndị Amalek na ndị Kenan bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo Homa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.