Ọnụọgụgụ 15

Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja.

Numbers 15:11 (UKJV) Thus shall it be done for one bullock, or for one ram, or for a lamb, or a kid.

9tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.

10Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.

11Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja.

12Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja.

13“ ‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.